Deuteronomy 5

Iwu iri

1Mosis kpọkọtara Izrel niile gwa ha okwu sị,

Geenụ ntị, unu Izrel, nʼụkpụrụ ndị a na iwu ndị a niile m na-agụpụta na ntị unu taa, mụtanụ ha, hụkwanụ na unu debere ha!
2Anyị na Onyenwe anyị Chineke anyị gbara ndụ nʼugwu Horeb. 3Ọ bụghị Onyenwe anyị na nna nna anyị ha gbara ndụ, kama ọ bụ anyị na ya, anyị niile ndị dị ndụ taa. 4Onyenwe anyị sitere nʼetiti ọkụ gwa unu okwu ihu na ihu nʼugwu ahụ. 5E guzoro m nʼetiti unu na Onyenwe anyị mgbe ahụ, ikwupụtara unu okwu Onyenwe anyị, nʼihi na unu tụrụ egwu ọkụ ahụ, unu arịgoghịkwa nʼugwu ahụ.

Ọ sịrị:

6“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ịbụ ohu.

7“Gị enwela chi ọzọ tinyere m.
8Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa. 9Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị. 10Ma na-egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu.
11Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
12Debe ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu. 13Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile, 14ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike. 15Ị ga-echetakwa na ị bụ ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke mere ka i si nʼohu pụta. Ọ bụ ike ya dị ukwuu ka o ji napụta gị. Ọ bụ ya mere Onyenwe anyị Chineke gị ji nye iwu na ị ga-edebe ụbọchị izuike nsọ.
16Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
17Gị egbula mmadụ.
18Gị akwala iko.
19Gị ezula ohi.
20Gị agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.
21Gị enwela anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala agụụ inwetara onwe gị ụlọ onye agbataobi gị, maọbụ nʼebe ala ya, maọbụ ohu ya nwoke, maọbụ ohu ya nwanyị, maọbụ ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi nwere dị.”

22Iwu ndị a ka Onyenwe anyị sitere nʼolu ike kwupụta nye ọgbakọ unu niile nʼelu ugwu ahụ, site nʼọkụ ahụ na igwe ojii ahụ na oke ọchịchịrị ahụ. O nweghị okwu ọzọ o tụkwasịrị nʼelu ya. O mechara dee ha na mbadamba nkume abụọ, nye m ha.

23Ma mgbe unu nụrụ oke olu ahụ kwuru okwu site nʼoke ọchịchịrị ahụ, hụkwa ire ọkụ ahụ dị egwu na-enwu nʼelu ugwu, ndịisi unu, ndị ndu ebo ọbụla na ndị okenye unu bịakwutere m. 24Unu sịrị, “Onyenwe anyị bụ Chineke anyị egosila anyị ebube ya, na ịdị ukwu ya, anyị anụkwala olu ya site nʼime ọkụ ahụ. Taa anyị ahụla na mmadụ pụrụ ịdị ndụ ọbụladị ma Chineke kpanyere ha ụka. 25Ma ugbu a nʼihi gịnị ka anyị ga-eji nwụọ? Ọkụ a, nke na-enwusi ike ga-erechapụ anyị. Anyị ga-anwụ ma ọ bụrụ na anyị anụ olu Onyenwe anyị Chineke anyị gaa nʼihu. 26Nʼihi na onye dị nʼetiti mmadụ, nke nụrụ olu Chineke dị ndụ ka ọ na-ekwu okwu site nʼetiti ọkụ, dịka anyị nụrụ ma dịrị ndụ. 27Gaa nso nụtara anyị ihe Onyenwe anyị Chineke anyị na-ekwu, mgbe ahụ, gwa anyị ihe ọbụla bụ nke ọ gwara gị, anyị ga-anụ, mekwa ya.”

28 Onyenwe anyị nụrụ olu okwu mgbe unu gwara m okwu, Onyenwe anyị sịrị m, “Anụla m ihe ndị a gwara gị. Ihe niile ha kwuru ziri ezi. 29Lee, ọ ga-adị nnọọ mma ma mkpụrụobi ha dị otu a, ịtụ egwu m, na idebe ihe niile m nyere ha nʼiwu, ka ihe gaara ha na ụmụ ha nke ọma mgbe niile ebighị ebi.

30“Gaa, gwa ha ka ha laghachi nʼụlọ ikwu ha. 31Ma gị onwe gị, guzo nʼebe a nʼakụkụ m, ka m nye gị iwu m na ụkpụrụ m niile, ị ga-akụziri ha idebe iwu m, ha aghakwaghị idebe ha nʼala ahụ m gaje inye ha ka ha nweta.”

32Lezienụ anya ime ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyere unu nʼiwu. Unu esitela na ha wezuga onwe unu gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 33Jegharịanụ ije nʼụzọ niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu nʼiwu, ka unu dịrị ndụ, baa ụba, ma meekwa ka ndụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga inweta.

Copyright information for IboBIU